Gaa na ọdịnaya

Alan Aderem

Shí Wikipedia, njikotá édémédé nke onyobulạ
Alan Aderem, PhD

Alan Aderem bụ onye America bụ ọkachamara n'ihe ndị dị ndụ, ọkachamara na immunology na cell biology. Ihe Aderem lekwasịrị anya kpọmkwem bụ usoro ahụ ji alụso ọrịa ọgụ, akụkụ nke usoro ahụ ji alụso ọrịa ọgụ nke na-emeso omume nye ụmụ ǹjé na-ebute ọrịa. Nnyocha ụlọ nyocha ya na-elekwasị anya na ọrịa ndị na-emetụta ụmụ amaala nke mba ndị dara ogbenye, gụnyere Ọrịa AIDS, ịba, ụkwara nta na influenza.[1][2]

Agụmakwụkwọ

[dezie | dezie ebe o si]

Aderem bụ onye South Africa, ọ sonyeere ndị na-emegide ịkpa ókè agbụrụ mgbe ọ dị afọ iri na ụma na South Africa. Ọ rụrụ ọrụ na òtù ndị ọrụ na òtù obodo, ma dezie akwụkwọ akụkọ obodo. A machibidoro Aderem iwu ma tụọ ya mkpọrọ n'ụlọ ruo afọ ise site n'afọ 1977 ruo 1982. Ọ bụkwa onye òtù na nzuzo nke African National Congress (ANC). Ọ hapụrụ South Africa n'afọ 1982.

Aderem nwetara nzere Ph.D. ya na Mahadum Cape Town wee mezue postdoctoral fellowship ya na Mahadum Rockefeller na ụlọ nnyocha nke Zanvil Cohn. Aderem ghọrọ onye isi nke ụlọ nyocha nke Signal Transduction n'afọ 1991. N'afọ 1996, ọ nakweere ọkwa prọfesọ nke Immunology na Mmụta ọgwụ na Mahadum Washington . [1]

N'afọ 2012, Aderem ghọrọ onye isi oche nke Seattle Biomedical Research Institute (Seattle BioMed). Aderem na Leroy Hood na Ruedi Aebersold guzobere Institute for Systems Biology n'afọ 2000 ma jee ozi dị ka onye nduzi ya ruo afọ 2011. ISB, bụ ụlọ ọrụ mbụ maka usoro ihe ndị dị ndụ n'ụwa niile, na-elekwasị anya na nghọta zuru oke nke ihe ndị dị ndụ, ahụike, na ọrịa.[1]

Aderem edeziela ọtụtụ akwụkwọ akụkọ gụnyere The Journal of Experimental Medicine, Current Opinion in Immunology, na Immunological Reviews. Nsọpụrụ ọkachamara ya gụnyere MERIT Award sitere na National Institutes of Health na ihe nrite Pew Scholars award, nsọpụrụ sitere na Burroughs Welcome Fund na American Heart Association.

Aderem na-eje ozi na kọmitii ndị ndụmọdụ sayensị nke International AIDS Vaccine Initiative; kọmitii na-eduzi sayensị na Global HIV Vaccine Enterprise; yana dịka onye òtù ndụmọdụ maka NIH LIPID MAPS Consortium. Aderem jere ozi dị ka onyeisi oche nke ndị nduzi nke ụlọ ọrụ KwaZulu-Natal Research Institute for Tuberculosis and HIV (KRITH) nke Howard Hughes Medical Institute na-akwado n'ego. A họpụtara ya ka ọ bụrụ onye isi oche nke Kọmitii ndị Nnyocha Iwu nke Kansụl Nnyocha Ọgwụ nke South Africa n'afọ 1996 na 2001, ma na-ejekwa ozi dị ka onye ndụmọdụ sayensị nye gọọmentị South Africa. Ọ na-ejekwa ozi na kọmitii ndụmọdụ nke International Immunology Frontier Research Center na Mahadum Osaka ma nọrọ na kọmpat ndị ndụmọdụ nke European Research Council.

Ezinụlọ

[dezie | dezie ebe o si]

Aderem lụrụ Kathy Barker, onye ya na ya nwere ụmụ atọ.

Edensibịa

[dezie | dezie ebe o si]
  1. 1.0 1.1 1.2 Alan Aderem - Faculty. depts.washington.edu. Retrieved on 2017-10-27.
  2. Alan Aderem, PhD · Institute for Systems Biology (en-US). Institute for Systems Biology. Archived from the original on 2020-08-15. Retrieved on 2020-05-05.

Njikọ mpụga

[dezie | dezie ebe o si]